About Here

Thursday, November 1, 2018

CRUSH💞CHRONICLES

I'm not saying anything on this one🤫Mhmm Mhmm... Don't do that. I won't tell🤐 If you read it and it's for you, then it's for you😜 😜😜

Well, I dedicate this one to beauty, beauté, mma. Igbo nna m sị na ihe dị mma na anya gbara ndụ. Mr. Flavor sị nọọ "kirikata..."

They say beauty is in the eyes of the beholder and that may be true, but there are beauties so glaring, so pronounced, so remarkable, that you have to be blind, or blind, not to behold them.

O nweghị onye ihe ọma na-asọ nsọ. Some beauties can't help but be in the eyes of every beholder. And yours truly is a chronic beholder. 👁️👁️I can behold for the whole wide world. Akirikata nwata dị mma, eziokwu agbaa m n'ọnụ🙉 

They say eat alone, die alone. This is me, sharing🗣️with you what I beheld. If I could post the pictures of all the Nwoke ọmas, I would. But they're too numerous; aga m etinye ole ghara ibe ya?🤔🤔🤔

If I tell you people now that one Nwoke Ọma escaped womb today, you'll say this one is for him; so I'm not telling🙊. Hell NO🤐!!! 

NWOKE ỌMA🧔

Nwoke ọma,
Jureeju nnwa...
Pokopoko nwa... 
Kirikata nnwa...

Oji ya rọ̀rọ̀ arọ;
Na-egbuke ka kristal ojii
Afụ dimkpa,
Afụ ogologo ụkwụ ya.

Ntutu isi ya juru eju;
Na-eji nnọọ ezigbote oji, 
Masasịa ka ahịhịa mmasa.

Anya👁️ya na-eke ka ọkụ. 
Nku anya ya na-ekucha ka akụpe. 
Iku anya ya jukatakwa eju... 

Imi👃ya sara mbara, 
Ma o meghị ndapịa.

Egbugbere ọnụ👄ya dị ka anụ;
Anụ dị nro na-eju ọnụ. 

Eze ọma si na chi... 
Ọ mụọ amụ ebe a, amụ atọọ gị🤩

Afụ ọnụ ya wụsara arụ,
Dị larịị;
Ọ naghị adụ ogwu ma ọlị

Ị hụtụla ya ebe ọ gba ahụ ụfụrụ? 
Obi ya dị ka ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ.
N'ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ a, 
Ka m ga-eme ka m makpuru

Ahụ ya mara abụba;
Ala ọma,
Na-emepụta ahịhịa ọma

Afọ ya rijuru afọ, 
Ma ọ bụghị udu afọ 

Mkpịsị aka👏ya wụsa,
Bụrụ sọ mma. 
Kọọzị mkpịsị ụkwụ ya? 

Nnwa à wụsa apata ya ebe a,
I koo. 
I koghị,
Ị mara na ị na-eko eko🤯
Leenụ ka ájị́ si yọsasịa na ya ka igirigi ndụ...
Leenụ ka anya m si eri nri a na-enye ndụ...

Olu okwu ya dị nwayọọ 
Olu ọchị ya na-ada ka egwu
Ọ chịa ọchị😂ebe a,
Akwara obi gị etee egwu...

Nwa eze🤴ka ọ bụ n'omume 
Ọ naghị achọ nsogbu 
Ọ dịghị ngwa ikwu
Ọ naghị ekwufu okwu...

A sị na ikiri nwoke a abụghị na nkịtị, 
M ga-akwụkata ụgwọ, akpa m atọgbọrọ nkịtị;🙆‍♀️
M resịzịa akpụkpọ ụkwụ m, gbaba ụkwụ nkịtị👣;
Enwekwara m ike ichefu ọrụ, nọrọzie nkịtị... 🤷‍♀️

A sị na ikiri nwoke a abụghị na nkịtị 
Ámà ndị iro ejidechago m n'úkwù🤦‍♀️
Maka na m ga-ebi, bie, bikwa
Ka m wee nweta ego m ga-eji kiri:
Ọrụ ọma a Chukwu rụrụ; 
Mma nke a Chukwu chọrọ;
Nri a🍛Olisa sara ahụ wee si...

Mana ebe m nọọrọ onwe m e kpugheere m nri a🍜;
O nweghịkwa onye sị m kwụta ụgwọ nri a;
Maka chi, m ga-adapụkwa n'elu nri a...

Ụnụ egbula m egbu, anaghị m eme na nkịtị, 
Maka na mma nnwa a abụghị ihe m ga-ahụ, gba nkịtị 🤗