About Here

Saturday, December 1, 2018

Mbulite Mmụọ (1)

Dearest lovers,
Welcome! And Happy first of last🥂🍾. 

The 'Mbulite Mmụọ/MOTIVATIONALS' segment is where I get to share with you the words that I say to myself when chips are down. Words that I hold very closely to my heart and hang tightly unto cos my life depends on them. 

In one of my down moments I came up with some lines that ministered (still minister) to me. So I brought them to you so they'll do you like they did me😉

Inscribe these words in your hearts, guard them very jealously and never  ever lose your smile😀

Tinye Amụ N'iru😃😊😃


Ụwa a enweghị isi
Mmadụ bụ mma ndụ
Ndụ pụọ
Mma ya arụọ...

Ndụ nwanụ enweghịkwu isi
Ihu na azụ, ndọlị
Aka nri aka ekpe, ndọlị
Emekata,
Ọ dị ka a dịghị eme...

Onye jisi ike,
Ọ ruo ala eze
Onye wee iwe,
Ọ ka ya njọ...

Ọ nweghị onye nwụsa arụ sọọ nsọ
Mana mmegharị ahụ bụ isi ndụ
Onye wụsakarịa ahụ,
Ọ wụsakwuo ndụ
Zabazie onye nwụrụ anwụ na-aga ije.

Ụwa bụ ndọlị ndọlị
Ebe ume ndụ ka dị
N'ala ndị dị ndụ
Mma ka dị na ndụ
Adọlịghị, ọ bụrụ gịnị?

Etu ndụ a hụrụ
Ya gbata kwụrụ
Ma mgbe ọdịniiru
Dị ka ọ na-agbarụ iru
Na mmekpa arụ
Na mgbakasị arụ
Na mkpakasị arụ
Kaba nnọọ arụ
Tinye amụ n'iru😀😊😀


4 comments: