About Here

Thursday, August 1, 2019

Nwadiala

August is finally here! Happy new month Lovelies😍

This one is for grandmothers, especially maternal grandmothers. So, by extension, this work is for maternal homes. What would life have been like without 'ikwu nne'? I don't even want to imagine it...

I dedicate this work specially to my very own mma nnukwu. We call her "mma ayị" or "mma ụmụrenne". If you read and understand the content, you will find that she inspired this work with one of her numerous jokes that she'd always pull our legs with...

We love her... 

Nwadiala



"Nne, ị dará ada?
... Ọnụ gị na-agba ọbara."

Nnaa nekwanụ mma ayị o...

Agara m ikwu nne m n'obodo;
'Ụmụrenne' n'olu ndị Ụga
Mụ na ụmụnne m kwụ ga... 

Oge ahụ bụ oge ezumike 
Mụ na ezinụlọ m lara izu ike... 

Nne m na nna m si otù obodo
Ị ga-ejinwu ụkwụ si be nna m gaa ikwu nne m
Anyị na-agacha ya, bata 
Ugboro atọ, anọ, ise n'ụbọchị 
Anyị na-echu be mma ka mmiri 
Anaghị m agba egbe okwu... 

Eziokwu, ọ na-atọ ncha
Ndị a kpasuo gị iwe be nna ị 
I fee aka, narie 
Ụmụrenne so sei! 

Onye mee na ọ ma aba mba
Ị ghalịa jewalụ 
Ọọ mụ ka Aba na-amụrụ ọkpọ? 

Ị̀talị mee ka ọ na-apụta, 
I tikapụ ọsọ
Gaa be mma zelụ mgbọ 
Gwuchapụ ụjọ n'egwuregwu
Were nri rijuchaa afọ
Ọ nwee ife gbasaa ị? 
Ọọ gịnwa sị ụmụrenne gị dị nso? 

Ọ sọ gị ị rahụ arahụ
Be ayị b'ayị nọ
Ma agwasịkwaa nwaanyị Enugu...

Nwimo sị na o nweghị ihe meganụ 
Ị samasịa arụ, wụsasịa arụ, naba
I dieruo ala, doo nwa arụ anị
Nakpuo ezigbo ụra 
Nwokpuru, e je emekweni aghaa? 
Oké nwa! Nwadiala!! 
N'eziokwu, onye nne ya nọ nso 
Anaghị ata ahụhụ... 

Mgbe ị ji nọjuo, ị lọta 
Obi adajụọ, ụtalị anakpuo 
Ị mụlịa, ụwa ana-asọ ị
Ben Johnson, onye ọsọ... 

Mana ọ bụrụ na ihe ị mee 
Jọgburu udene sigbuo nkakwụ n'isì,
I che na agbatalịa n'ọsọ? 
Ị gbachaa bata, ị nar'ụtalị gị
Ewo! 
M gara marakwa m nọrọkwuo 
Nwokpuru, ị ga-atọkwanụ n'ọsọ? 

A sị gị waa nkụ be nna ị,
Ị na-ebe na ọ tara akpụ̀
I ruo ụmụrenne, ị sụọ akpụ
A sị̀ gị sụọ akpụ, ị jụrụ ajụ 
Mana ị ruo ụmụrenne, I nwoo akwụ 
"Nwoo akwụ" 
"Aka na-elo m ilo." 
Ị gaa be mma ị zaa ilo
Ị gbara ọsọ ozi gbata n'ozi
Onye nne ya nọ nso na-eje ozi... 

Mana ozi be mma na-atọ ụtọ 
O nwee ụdị ụtọ ọ na-atọ 
Ụtọ ya pụrụ iche...

Ị na-asụ akpụ be nna gị
Okpoofufu esi enu si anị
Mana ị na-asụ be mma
Ọ dị ka a na-eku gị akupe... 

Akwụ be mma ayị enweghị ogwu 
Ọ ka nke be nnaa nwe ọsụkwụ...

Ịza mbara na-atọ ncha
Ịzagide mbara, ị nụ ísì ụ́tara
Ị tụpụ akpata na mbara gaba iri ụtara
"Akpụ nke a atọka... 
Ofe ne na-agbalagha agbalagha... Mmmkpaa!
Ka m gbachakwaal'ụnụ ọnụ
Mma, m ma-erikwu...🍛" 
Ọọ gịnwa mekwaanụ ụwa? 
Onye nne ya nọ nso na-ekpori ndụ

Ụmụrenne bụ ndo
Nga a na-eme ghị nwa nọrọ nso
Elekwenee ihe i jihi je-akpaị nso?

Ụmụrenne enweghị arịrị
Anya mma mee gị
Ị pụkwu ya ọrịrị
"Nne de nne o"
"Nwa ọsa m oyooyo"
Oké nwa! Nwadiala!!
Ị nwudolie ọkụkọ ghịị nwụrụ laa
Ọ kwehe ghị nnwudo ghịị hapụ ya
Anụ gbalaa taa
Echi wụaha nta
Echi ghịị biaha ọdụọ
Ụmụrenne ọ na-ejukweni afọ,
Nke o ji agbụ agbụ?

Etu a k'ayị si kụchal'ụkwụ k'ayị si akụcha
Gaa be mma ayị  kenechaa mma ayị
Ihe ọzọ m nụụ bụ:
"Nne, ị darà ádá?"
M kirie onwe m ihu na azụ
"Hịa! Mma, ị sị...?"
"Asị m ma ị dara ada n'ugwu ihee Giribaatị?
Ọnụ ghị na-agba ọbara"

Hịa!
Ọsọ ka m ji gbakwuru enyo
Ị fụkwa ka m si na-enyo enyo
Ka m maranụ ma ọbara nwa ana-ekwo ekwo
Amazịkwa m mgbe m dara ada nwa?
Ka ana m ekozi eko?

Amaa m na mma ayị na-achị m ọchị
M were enyo gbapụta hụ ya ebe ọ na-achị
Ọchị mma ayị na-atọ ọchị
Ị maágodi ihe ọ na-achị
Ị ga-akwakapụ ọchị
Mana ama m ihe ọ na-achị
Enyo gwara m ihe ọ na-achị
Ụmụnne m na-achịkwu ọchị
Ha amaakwa ihe na-atọ ọchị na-achị
"Ụnụ ama nọọ ihe m tere n'ọnụ
Ka mma ayị na-akpọ ọbara?"
Ọchị maburu ayị ncha
Ayị wee chiwaberi nke wụ ọchị
"Mma elekwenee...?  Hihihahahahahahahaha...
Mma nnukwu ayị nke a sef..."

Mma ayị ma akpa ụka ọchị
Ọ na-achọ k'ayị na-achị ọchị
Mma ayị na-eme ayị mma
Ka obi na-adị ayị mma. 🤗








2 comments:

  1. Did you eat pork, your lips are soooo oily (itara anu ezi)? ������. Mama nnukwu.....

    ReplyDelete